Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 2:21-32 Bible Nso (IGBOB)

21. Abnea we si ya, Wezuga onwe-gi n'aka-nri-gi ma-ọbu n'aka-ekpe-gi, jidere onwe-gi otù nime umu-okorọbia, chiri n'onwe-gi ihe-ya i gāluta. Ma Asahel ekweghi isi n'iso ya wezuga onwe-ya.

22. Abnea we si kwa Asahel ọzọ, Si n'isom wezuga onwe-gi: nìhi gini ka m'gētib͕u gi rue ala? m'gēsi kwa aṅa weliere Joab nwa-nne-gi irum?

23. Ma ọ juru iwezuga onwe-ya: Abnea we were isi ube-ya tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise, ube we puta n'azu ya, o we da n'ebe ahu, nwua n'okpuru ya: o rue, na ndi nile ndi biaruru ebe ahu, bú ebe Asahel dara nwua, guzoro.

24. Ma Joab na Abishai churu Abnea n'azu; anyanwu we da mb͕e ndi ahu biaruru ugwu ntà Ama, nke di n'iru Gia n'uzọ ọzara Gibeon.

25. Umu Benjamin we chikọta onwe-ha iso Abnea n'azu, ha we ghọ otù usu, guzo, n'elu otù ugwu ntà.

26. Abnea we kpọ Joab òkù, si, Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka mma-agha gēripia? ì maghi na ilu ka ọ gādi n'ikpe-azu? rù kwa ole mb͕e ka i nāgaghi-asi ndi-gi ka ha si n'iso umu-nne-ha laghachi?

27. Joab we si, Chineke nādi ndu, ọ buru na i kwughi, n'ezie mb͕e ahu site n'ututu ndim gārigowori, nwoke ọ bula site n'iso nwa-nne-ya.

28. Joab we fùa opì-ike, ndi-ya nile we guzo, ha achughi kwa Israel n'azu ọzọ, ha ebughi kwa agha ọzọ.

29. Ma Abnea na ndikom-ya jere ije n'Araba abali ahu nile; ha we gabiga Jọdan, je ije na Bitron nile, bia rue Mahanaim.

30. Joab we si n'iso Abnea lata: ọ we chikọta ndi-ya nile, ma agukọtara ndikom iri na iteghete na Asahel ndi nādighi n'etiti ndi-orù Devid.

31. Ma ndi-orú Devid tib͕uru ọgu ndikom iri-na-asatọ sitere na Benjamin, na n'etiti ndikom Abnea, ha we nwua.

32. Ha we bulie Asahel, lìe ya n'ílì nna-ya, nke di na Bet-lehem. Joab na ndikom-ya we je ije abali ahu nile, ìhè ututu we putara ha na Hebron.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 2