Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 19:8-15 Bible Nso (IGBOB)

8. Eze we bilie, nọdu n'ọnu-uzọ-ama. Ha we gosi ndi ya nile, si, Le, eze nānọdu n'ọnu-uzọ-ama: ndi ahu nile we bia n'iru eze.Ma Israel b͕alagara, nwoke o bula n'ulo-ikwū-ya.

9. Ndi Israel nile we nēse okwu n'ebo nile nke Israel, si, Eze naputara ayi n'ọbu-aka ndi-iro-ayi, ya onwe-ya me kwa-ra ka ayi wepuga onwe-ayi n'ọbu-aka ndi Filistia; ma ub͕u a o siwo n'ala b͕alaga n'ihi Absalom.

10. Ma Absalom, onye ayi tere manu ibu isi-ayi, anwuwo n'agha. Ma ub͕u a n'ihi gini ka unu onwe-unu nādighi-ekwu ime ka eze lata?

11. Eze, bú Devid, we zigara Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, ozi, si, Gwanu ndi-okenye Juda okwu, si, N'ìhi gini ka unu bu ndi-ikpe-azu ime ka eze lata n'ulo-ya? ma okwu Israel nile abiaruwo eze nti, ime ka ọ lata n'ulo-ya?

12. Umu-nnem ka unu bu, ọkpukpum na anu-arum ka unu bu: n'ìhi gini kwa ka unu bu ndi-ikpe-azu ime ka eze lata?

13. Amasa ka unu gāsi kwa, Ọ̀ bughi ọkpukpum na anu-arum ka i bu? Chineke mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, ma ọ buru na i ghọghi onye-isi usu-ndi-agha n'irum ubọchi nile n'ọnọdu Joab.

14. O we me ka obi ndikom nile nke Juda rulata, dika otù nwoke; ha we zigara eze ozi, si, Lata, gi onwe-gi na ndi-orù-gi nile.

15. Eze we lata, bia rue Jọdan. Juda we biarue Gilgal, ije izute eze, ime ka eze gabiga Jọdan.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 19