Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 19:33-43 Bible Nso (IGBOB)

33. Eze we si Bazilai, Gi onwe-gi sorom gabiga, m'gāzù kwa gi n'ebe m'nọ na Jerusalem.

34. Bazilai we si eze, Ùbọchi arọ nke ndum di ole, m'gēji soro eze rigorue Jerusalem?

35. Ọgu arọ anọ ka m'b͕ara ta: m'gāmara ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ? òrù-gi gāmata utọ ihe m'nēri ma-ọbu nke m'nāṅu? m'gēge nti ọzọ n'olu ndikom nābu abù na ndinyom nābu abù? n'ihi gini kwa ka orù-gi gāburu onye-nwem, bú eze, ibu ọzọ?

36. Dika ihe ntà orù-gi nēso eze gabiga Jọdan: n'ìhi gini kwa ka eze gēnyeghachim ihe-nnyeghachi a?

37. Biko, ka orù-gi laghachi, ka m'we nwua n'obodom, n'akuku ílì nnam na nnem. Ma, le, orù-gi, bú Kimham; ya soro onye-nwem, bú eze, gabiga; gi me-kwa-ra ya ihe di nma n'anya-gi.

38. Eze we si, Kimham gēsom gabiga, mu onwem gēme-kwa-ra ya ihe di nma n'anya-gi: ma ihe ọ bula i gārọputa ka m'mere gi, m'gēmere gi ya.

39. Ndi Devid nile we gabiga Jọdan, eze gabiga-kwa-ra: eze we sutu Bazilai ọnu, gọzie ya: o we laghachi n'ebe-ya.

40. Eze we gabiga rue Gilgal, Kimham so-kwa-ra ya gabiga: ndi nile nke Juda we me ka eze gabiga, ha na nkera ndi Israel.

41. Ma, le, ndikom nile nke Israel nābiakute eze, we si eze, Gini mere umu-nne-ayi, bú ndikom Juda, zupuru gi n'ori, me ka eze na ulo-ya gabiga Jọdan, na ndikom Devid nile tiyere ya?

42. Ndikom nile nke Juda we za ndikom Israel, si, N'ihi eze di ayi nso n'aru: n'ìhi gini kwa ka iwe-unu di ọku bayere ihe a? àyi eriwo ihe si n'aka eze puta ma-ọli? ọ̀ di onyinye-nri ọ bula o wetara ayi?

43. Ndikom Israel we za ndikom Juda, si, Òkè iri ka ayi nwere n'eze, ọzọ kwa, ayi nwere òkè nime Devid kari unu: gini me-kwa-ra unu lelìri ayi anya, ka okwu-ayi ghara ibu uzọ n'ime ka eze-ayi lata? Ma okwu ndikom Juda siri ike kari okwu ndikom Israel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 19