Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 19:25-37 Bible Nso (IGBOB)

25. O rue, mb͕e ọ biaruru Jerusalem izute eze, na eze siri ya, N'ìhi gini ka i nēsoghm je, Mefiboshet?

26. Ọ si, Onye-nwem, eze, orùm ghọb͕urum: n'ihi na orù-gi siri, Ka m'jikwara onwem inyinya-ibu, ka m'we nọkwasi ya, soro eze je; n'ihi na orù-gi dara ngwurọ.

27. O we kwulu orù-gi n'ebe onye-nwem, bú eze, nọ; ma onye-nwem, bú eze, di ka onye-ozi Chineke: gi me kwa ihe di nma n'anya-gi.

28. N'ihi na ulo nnam nile abughi ihe ọ bula ma-ọbughi ndi ọnwu n'iru onye-nwem, bú eze: ma i doro orù-gi n'etiti ndi nēri ihe na table nke gi. Ma èzi omume gini ka m'nwere ọzọ itiku eze nkpu ọzọ?

29. Eze we si ya, N'ìhi gini ka i nēkwu okwu bayere okwu-gi nile ọzọ? Asiwom, Gi onwe-gi na Ziba gēkè ubi ahu.

30. Mefiboshet we si eze, E, ya were ihe nile, ebe onye-nwem, bú eze, biaworo n'ulo-ya n'udo.

31. Bazilai, bú onye Gilead, we si na Rogelim rida; o we soro eze gabiga Jọdan, izilaga ya n'ofè Jọdan.

32. Ma Bazilai mere agadi nke-uku, ọ b͕ara ọgu arọ anọ: ya onwe-ya zù-kwa-ra eze mb͕e ọ nānọdu na Mahanaim; n'ihi na oké madu ka ọ bu nke-uku.

33. Eze we si Bazilai, Gi onwe-gi sorom gabiga, m'gāzù kwa gi n'ebe m'nọ na Jerusalem.

34. Bazilai we si eze, Ùbọchi arọ nke ndum di ole, m'gēji soro eze rigorue Jerusalem?

35. Ọgu arọ anọ ka m'b͕ara ta: m'gāmara ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ? òrù-gi gāmata utọ ihe m'nēri ma-ọbu nke m'nāṅu? m'gēge nti ọzọ n'olu ndikom nābu abù na ndinyom nābu abù? n'ihi gini kwa ka orù-gi gāburu onye-nwem, bú eze, ibu ọzọ?

36. Dika ihe ntà orù-gi nēso eze gabiga Jọdan: n'ìhi gini kwa ka eze gēnyeghachim ihe-nnyeghachi a?

37. Biko, ka orù-gi laghachi, ka m'we nwua n'obodom, n'akuku ílì nnam na nnem. Ma, le, orù-gi, bú Kimham; ya soro onye-nwem, bú eze, gabiga; gi me-kwa-ra ya ihe di nma n'anya-gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 19