Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 19:12-28 Bible Nso (IGBOB)

12. Umu-nnem ka unu bu, ọkpukpum na anu-arum ka unu bu: n'ìhi gini kwa ka unu bu ndi-ikpe-azu ime ka eze lata?

13. Amasa ka unu gāsi kwa, Ọ̀ bughi ọkpukpum na anu-arum ka i bu? Chineke mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, ma ọ buru na i ghọghi onye-isi usu-ndi-agha n'irum ubọchi nile n'ọnọdu Joab.

14. O we me ka obi ndikom nile nke Juda rulata, dika otù nwoke; ha we zigara eze ozi, si, Lata, gi onwe-gi na ndi-orù-gi nile.

15. Eze we lata, bia rue Jọdan. Juda we biarue Gilgal, ije izute eze, ime ka eze gabiga Jọdan.

16. Shimai nwa Gira, bú onye Benjamin, nke sitere na Bahurim, we me ngwa soro ndikom Juda ridata izute eze, bú Devid.

17. Nnù ndikom abua na ọgu iri so-kwa-ra ya site na Benjamin; Ziba kwa, onye nējere ulo Sọl ozi, ya na umu-ya ndikom iri na ise na orú ndi-orú-ya; ha we jisie ike gabiga Jọdan n'iru eze.

18. Ma ub͕o-nwebiga gabigara iwebiga ndi ulo eze, na ime ihe di nma n'anya-ya. Shimai nwa Gira we da n'iru eze, mb͕e ọ gabigara Jọdan.

19. Ọ si eze, Ka onye-nwem ghara igu ajọ omume nyem, echeta-kwa-la ihe orù-gi mere n'ajọ omume n'ubọchi onye-nwem, bú eze, siri na Jerusalem pua, ka eze we tiye ya n'obi-ya.

20. N'ihi na orù-gi amawo na mu onwem emehiewo: ma, le, abiawom ta, buru ulo nile nke Josef uzọ irida izute onye-nwem, bú eze.

21. Abishai nwa Zeruaia we za, si, Àgaghi-eme ka Shimai nwua n'ihi nka, n'ihi na ọ kọchara onye Jehova etere manu?

22. Devid we si, Gini ka mu na unu nwekọrọ, umu-ndikom Zeruaia, na unu gāburum onye-nmegide ta? àgēme ka nwoke ọ bula nwua n'Israel ta? n'ihi na ọ̀ bu na amaghm na ta ka mu onwem bu eze Israel?

23. Eze we si Shimai, I gaghi-anwu. Eze we ṅuara ya iyi.

24. Mefiboshet nwa Sọl rida-kwa-ra izute eze; ma o dozighi ukwu-ya, o dozighi kwa afu-ọnu-ya, ọ sughi kwa uwe-ya miri, site n'ubọchi eze jere rue ubọchi mb͕e ọ bia-kwa-ra n'udo.

25. O rue, mb͕e ọ biaruru Jerusalem izute eze, na eze siri ya, N'ìhi gini ka i nēsoghm je, Mefiboshet?

26. Ọ si, Onye-nwem, eze, orùm ghọb͕urum: n'ihi na orù-gi siri, Ka m'jikwara onwem inyinya-ibu, ka m'we nọkwasi ya, soro eze je; n'ihi na orù-gi dara ngwurọ.

27. O we kwulu orù-gi n'ebe onye-nwem, bú eze, nọ; ma onye-nwem, bú eze, di ka onye-ozi Chineke: gi me kwa ihe di nma n'anya-gi.

28. N'ihi na ulo nnam nile abughi ihe ọ bula ma-ọbughi ndi ọnwu n'iru onye-nwem, bú eze: ma i doro orù-gi n'etiti ndi nēri ihe na table nke gi. Ma èzi omume gini ka m'nwere ọzọ itiku eze nkpu ọzọ?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 19