18. Ma Absalom, mb͕e ọ nọ na ndu, o were ogidi nke di na ndagwurugwu eze guzoro onwe-ya: n'ihi na ọ siri, Enweghm nwa-nwoke ime ka echeta aham: o we kpọ ogidi ahu n'aha-ya: ewe kpọ ya ihe-ncheta Absalom, rue ta.
19. Ahimaaz nwa Zedok we si, Biko, ka m'b͕a ọsọ zìe eze ozi ọma, na Jehova ekpeputawo ya n'aka ndi-iro-ya.
20. Joab we si ya, Ọ bughi onye ozi ọma ka i gābu ta, kama i gēzi ozi ọma ubọchi ọzọ: ma ta i gaghi-ezí ozi ọma, n'ihi na nwa eze anwuwo.