Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 18:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Devid we gukọta ndi ya na ha nọ, do ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu ọgu ndikom ise ichi ha.

2. Devid we zipu ndi ahu, otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Joab, na otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Abishai nwa Zeruaia, nwa-nne Joab, na otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Itai, bú onye Gat Eze we si ndi-ya, Aghaghm iso unu pua, ọbuná mu onwem.

3. Ndi-ya we si, I gaghāpu: n'ihi na ọ buru na ayi ab͕alaga ab͕alaga, ha agaghi-atukwasi ayi obi: ọ buru kwa na nkera nime ayi anwua, ha agaghi-atukwasi ayi obi: n'ihi na ub͕u a orú nnù ndikom na nnù ise dika ayi di; ma ub͕u a ọ di nma ka i buru ayi onye-iye-aka site n'obodo.

4. Eze we si ha, Ihe di nma n'anya-unu ka m'gēme. Eze we guzo n'akuku ọnu-uzọ-ama, ndi-ya nile we nāpu n'ọgu ise ọgu ise, na nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri.

5. Eze we nye Joab na Abishai na Itai iwu, si, Menu nwayọ n'aru nwa-okorọbia, bú Absalom, n'ihim. Ndi-ya nile nu-kwa-ra mb͕e eze nyere ndi-isi nile iwu bayere Absalom.

6. Ndi-ya we pua je n'ọhia izute Israel: agha ahu we di n'oké ohia Efraim.

7. Ewe tib͕ue ndi Israel n'ebe ahu n'iru ndi-orù Devid, ntib͕u uku we di n'ebe ahu n'ubọchi ahu, bú orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri.

8. Ewe nāb͕asa agha ahu n'ebe ahu n'elu ala ahu nile; oké ọhia ahu we ripia ọtutu madu n'etiti ndi Israel n'ubọchi ahu kari ndi mma-agha ripiara.

9. Absalom we zute ndi-orù Devid. Ma Absalom nānọkwasi n'inyinya mule-ya, inyinya mule ahu we ba n'okpuru alaka tuhiri atuhi nke oké osisi terebinth, isi-ya we kogide n'osisi terebinth ahu, ewe do ya n'etiti elu-igwe na ala; ma inyinya mule ahu nke di n'okpuru ya gabigara.

10. Otù nwoke we hu ya, gosi Joab, si, Le, ahurum Absalom ka ọ kwuru n'osisi terebinth.

11. Joab we si nwoke ahu nke nēgosi ya, Ma, le, i huru ya, ma gini mere i tib͕ughi ya n'ebe ahu rue ala? ọ gābu kwa ọlum inye gi ọla-ọcha iri, na otù ihe-ọkiké.

12. Nwoke ahu we si Joab, Ọ buru kwa na mu onwem ejide n'ọbu-akam nnù ọla-ọcha abua na ọgu iri, ma m'gaghi-eseti akam imegide nwa eze: n'ihi na ọ bu na nti-ayi ka eze nyere gi na Abishai na Itai iwu, si, Lezienu anya bayere nwa-okorọbia ahu, bú Absalom, onye ọ bula.

13. Ma asi na emem otú a, m'gēme ihe-ugha megide ndum, (ma ọ dighi okwu ọ bula agēzonari eze,) gi onwe-gi gēguzo kwa onwe-gi n'akuku ọzọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 18