Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 17:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ahitofel we si Absalom, Biko, ka m'rọputa orú nnù ndikom na nnù iri, bilie, chua Devid n'azu n'abali a:

2. m'gābiakwasi kwa ya mb͕e ike gwuru ya onwe-ya, na mb͕e aka-ya nādighi ike, m'gēme kwa ka ọ ma jijiji: ndi nile ndi ya na ha nọ gāb͕alaga kwa; m'gētib͕u kwa eze, nání ya:

3. m'gēme kwa ka ndi-ya nile laghachikute gi: dika nlaghachi madu nile ka nwoke ahu bu, onye gi onwe-gi nāchọ: ndi Israel nile gānọ n'udi.

4. Okwu ahu ziri ezi n'anya Absalom na n'anya ndi-okenye nile nke Israel.

5. Absalom we si, Biko, kpọ kwa Hushai, bú onye-Akait, ka ayi nuru kwa ihe di kwa n'ọnu ya onwe-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 17