15. Absalom na ndi nile, bú ndikom Israel, we ba na Jerusalem, Ahitofel so-kwa-ra ya ba.
16. O rue, mb͕e Hushai, bú onye-Akait, bú eyì Devid, biakutere Absalom, na Hushai siri Absalom, Ka eze di ndu, ka eze di ndu.
17. Absalom we si Hushai, Ọ̀ bu nka bu ebere i nēmere eyi-gi? n'ìhi gini ka i nēsoghi eyì-gi je?
18. Hushai we si Absalom, É-è, kama onye Jehova na ndi nka na ndikom nile nke Israel rọputaworo, ya ka m'gādiri, ọ bu kwa n'aka-ya ka m'gēbiri.
19. Ọzọ kwa, ònye ka mu onwem gēfè òfùfè? Ọ̀ bughi n'iru nwa-ya? dika m'fèworo òfùfè n'iru nna-gi, otú a ka m'gābu n'iru gi.
20. Absalom we si Ahitofel, Duanu ọdu n'onwe-unu ihe ayi gēme.
21. Ahitofel we si Absalom, Bakuru ndi-iko nna-gi ndinyom, ndi o mere ka ha nọdu iche ulo; Israel nile gānu kwa na i nēsi nna-gi ísì ọjọ: aka ndi nile gi na ha nọ gādi kwa ike.