Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 16:11-22 Bible Nso (IGBOB)

11. Devid we si Abishai, si kwa ndi-orù-ya nile, Le nwam, nke siri n'afọm puta, nāchọ ndum: onye Benjamin nka, ò gēsi kwa aṅa ghara ichọkari ya ub͕u a? ka ọ nọduru onwe-ya, ka ọ kọcha kwa; n'ihi na Jehova siworo ya, Kọcha.

12. Eleghi anya Jehova gēlekwasi nwedam anya, Jehova gēnyeghachikwam ezi ihe n'ọnọnọdu nkọcha-ya ta.

13. Devid na ndikom-ya we je n'uzọ ahu: Shimai nēje kwa n'akuku ugwu na ncherita-iru ya, ọ nēje ije we kọcha, tu kwa nkume na ncherita-iru ya, kpoli kwa ájá.

14. Eze na ndi nile ndi ya na ha yikọrọ je, we biarue Ayefim; o we turu ndu n'ebe ahu.

15. Absalom na ndi nile, bú ndikom Israel, we ba na Jerusalem, Ahitofel so-kwa-ra ya ba.

16. O rue, mb͕e Hushai, bú onye-Akait, bú eyì Devid, biakutere Absalom, na Hushai siri Absalom, Ka eze di ndu, ka eze di ndu.

17. Absalom we si Hushai, Ọ̀ bu nka bu ebere i nēmere eyi-gi? n'ìhi gini ka i nēsoghi eyì-gi je?

18. Hushai we si Absalom, É-è, kama onye Jehova na ndi nka na ndikom nile nke Israel rọputaworo, ya ka m'gādiri, ọ bu kwa n'aka-ya ka m'gēbiri.

19. Ọzọ kwa, ònye ka mu onwem gēfè òfùfè? Ọ̀ bughi n'iru nwa-ya? dika m'fèworo òfùfè n'iru nna-gi, otú a ka m'gābu n'iru gi.

20. Absalom we si Ahitofel, Duanu ọdu n'onwe-unu ihe ayi gēme.

21. Ahitofel we si Absalom, Bakuru ndi-iko nna-gi ndinyom, ndi o mere ka ha nọdu iche ulo; Israel nile gānu kwa na i nēsi nna-gi ísì ọjọ: aka ndi nile gi na ha nọ gādi kwa ike.

22. Ha we b͕asara Absalom ulo-ikwū n'elu ulo; Absalom we bakuru ndi-iko nna-ya ndinyom n'anya Israel nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 16