Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 15:33-37 Bible Nso (IGBOB)

33. Devid we si ya, Ọ buru na i sorom gabiga, i gābu-kwa-ram ibu:

34. ma ọ buru na i laghachi n'obodo, we si Absalom, Orù-gi ka m'bu, eze; dika mu onwem bu orù nna-gi na mb͕e gara aga, ub͕u a mu onwem gābu kwa orù-gi: i gēmebi-kwa-ram idu-ọdu Ahitofel.

35. Gi na ha anọghi kwa n'ebe ahu, bú Zedok na Abaiata ndi-nchu-àjà? o gēru kwa, na okwu ọ bula i gānu site n'ulo eze, i gēgosi ya Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà.

36. Le, ha na umu-ha ndikom abua nọ n'ebe ahu, bú Ahimaaz nwa Zedok, na Jonatan nwa Abaiata; site n'aka-ha ka unu gēzite-kwa-ram okwu ọ bula unu gānu.

37. Hushai, bú eyi Devid, we ba n'obodo; Absalom ba-kwa-ra nime Jerusalem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 15