Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 13:8-15 Bible Nso (IGBOB)

8. Tema we je n'ulo Amnon nwa-nne-ya; ma onye ahu nēdina edina. O we were utu ọka flour agwọrọ agwọ, gwọ ya, me achicha n'anya-ya, sie achicha ahu.

9. O were ite, wupu ha n'iru ya; ma ọ juru iri ha. Amnon we si, Me ka madu ọ bula si n'ebe m'nọ pua. Ha we pua, madu ọ bula, n'ebe ọ nọ.

10. Amnon we si Tema, Bubata ihe-oriri n'ime-ulo, ka m'we rie ya n'aka-gi. Tema we chiri achicha nke o mere, chitara Amnon nwa-nne-ya n'ime-ulo.

11. Ọ chita ha nso ya ka o rie, Amnon we jide ya, si ya, Bia, sorom dina, nwa-nnem.

12. Ọ si ya, É-è nwa-nnem, ewedalam n'ala; n'ihi na adighi-eme otú a n'Israel: emela ihe-nzuzu a.

13. Ma mu onwem, òle ebe m'gēme ka ita-utam la? ma gi onwe-gi, i gādi ka otù onye nime ndi-nzuzu n'israel. Ma ub͕u a, biko, gwa eze okwu; n'ihi na ọ gaghi-eb͕ochim n'ebe i nọ.

14. Ma ọ kweghi ige nti olu-ya: ọ di kwa ike kari ya, ọ we weda ya n'ala, soro ya dina.

15. Amnon we kpọ ya asì, bú ikpọ-asì di uku ri nne; n'ihi na ikpọ-asì ọ kpọrọ ya di uku kari ihu-n'anya ọ huru. Amnon we si ya, Bilie, la.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 13