Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 13:34-39 Bible Nso (IGBOB)

34. Absalom we b͕alaga. Nwa-okorọbia nke nēche nche we welie anya-ya hu, ma, le, ndi riri nne nābia site n'uzọ akuku ugwu di n'azu ya.

35. Jonadab we si eze, Le, umu-ndikom eze abiawo: dika okwu orù-gi kwuru, otú a ka ọ di.

36. O rue na, mb͕e o kwubìri okwu, le, umu-ndikom eze biara, welie olu-ha, kwa ákwá: ọzọ kwa eze na ndi-orù-ya nile kwara ákwá di uku ri nne.

37. Ma Absalom b͕alagara jekuru Talmai nwa Amihua, eze Geshua. Devid we nēru újú nwa-ya ubọchi nile.

38. Absalom we b͕alaga, jerue Geshua, nọ n'ebe ahu arọ atọ.

39. Agu nāgusi nkpuru-obi Devid, bú eze, ike ipukuru Absalom: n'ihi na akasiri ya obi bayere Amnon, n'ihi na ọ nwuwo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 13