33. Ma ub͕u a ka onye-nwem, bú eze, ghara ido okwu a n'obi-ya, si, Umu-ndikom eze nile anwuwo, n'ihi na Amnon, nání ya, nwuru anwu.
34. Absalom we b͕alaga. Nwa-okorọbia nke nēche nche we welie anya-ya hu, ma, le, ndi riri nne nābia site n'uzọ akuku ugwu di n'azu ya.
35. Jonadab we si eze, Le, umu-ndikom eze abiawo: dika okwu orù-gi kwuru, otú a ka ọ di.