Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 13:23-35 Bible Nso (IGBOB)

23. O rue, mb͕e arọ abua zuru ezu gasiri, na Absalom nwere ndi nākpacha aji anu na Beal-hezoa, nke di n'akuku Efraim: Absalom we kpọ umu-ndikom eze nile.

24. Absalom we biakute eze, si, Biko, le, Orù-gi nwere ndi nākpacha aji anu; biko, ka eze na ndi-orù-ya soro orù gi je.

25. Eze we si Absalom, É-è, nwam, biko, emela ka ayi nile je, ka ayi we ghara ibu edi arọ́ n'isi gi. O rugid ya: ma o kweghi ije, ma ọ gọziri ya.

26. Absalom we si, Ma ọ buru na i jeghi, biko, ka Amnon nwa-nnem soro ayi je. Eze we si ya, Nìhi gini ka ọ gēsoro gi je?

27. Absalom we rugide ya, o we zie Amnon na umu-ndikom eze nile ka ha soro ya je.

28. Absalom we nye ndi-orù-ya iwu, si, Biko, lezienu anya. mb͕e obi Amnon di nma na manya-vine; mb͕e m'si kwa unu, Tibuenu Amnon, menu ka ọ nwua, unu atula egwu: ọ̀ bughi na mu onwem enyewo unu iwu? dinu ike, buru-kwa-nu ndi-dìnkpà.

29. Umu-okorọbia Absalom we me Amnon dika Absalom nyere iwu. Umu-ndikom eze nile we bilie, rikwasi, nwoke ọ bula n'elu inyinya mule-ya, ha we b͕alaga.

30. O rue, mb͕e ndi ahu nọ n'uzọ, na akukọ ahu biaruru Devid nti, si, Absalom eb͕uwo umu-ndikom eze nile, ọ dighi kwa otù onye fọduru nime ha.

31. Eze we bilie, dọwa uwe-ya nile, dina n'ala; ndi-oru-ya nile nēguzo kwa, ha na uwe-ha dọwara adọwa.

32. Jonadab, nwa Shimea nwa-nne Devid, we za, si, Ka onye-nwem ghara isi na emewo ka umu-okorọbia nile, bú umu eze, nwua; n'ihi na Amnon, nání ya, nwuru anwu: n'ihi na edoro nka n'okwu-ọnu Absalom site n'ubọchi o wedara Tema nwa-nne-ya n'ala.

33. Ma ub͕u a ka onye-nwem, bú eze, ghara ido okwu a n'obi-ya, si, Umu-ndikom eze nile anwuwo, n'ihi na Amnon, nání ya, nwuru anwu.

34. Absalom we b͕alaga. Nwa-okorọbia nke nēche nche we welie anya-ya hu, ma, le, ndi riri nne nābia site n'uzọ akuku ugwu di n'azu ya.

35. Jonadab we si eze, Le, umu-ndikom eze abiawo: dika okwu orù-gi kwuru, otú a ka ọ di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 13