Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 13:15-20 Bible Nso (IGBOB)

15. Amnon we kpọ ya asì, bú ikpọ-asì di uku ri nne; n'ihi na ikpọ-asì ọ kpọrọ ya di uku kari ihu-n'anya ọ huru. Amnon we si ya, Bilie, la.

16. Ọ si ya, Emela otú a, n'ihi na ihe ọjọ uku a n'izilagam jọrọ njọ kari nke-ọzọ nke i merem. Ma o kweghi ige ya nti.

17. O we kpọ nwa-okorọbia-ya nke nejere ya ozi, si, Biko, si n'ebe m'nọ chupu nwayi a n'èzí, kpachie uzọ n'azu ya.

18. Ma uwe-nwudaa nwere aka di n'aru ya: n'ihi na uwe-nwuda di otú a ka umu-ndinyom eze ndi nāmaghi nwoke nēyi. Onye nējere ya ozi we me ka ọ pua n'èzí, we kpachie uzọ n'azu ya.

19. Tema we būru ntu n'isi-ya dọwa uwe-nwuda nwere aka nke di n'aru ya; ọ tukwasi aka-ya n'isi-ya, we la, nēje nēti nkpu.

20. Absalom, bú nwa-nne-ya, we si ya, Amnon nwa-nne-gi, ò sorowo gi dina? ma ub͕u a, nwa-nnem, b͕a nkiti: nwa-nne-gi ka ọ bu; atukwasila obi-gi n'ihe a. Tema we nọdu dika nwayi arapuru nání ya, n'ulo Absalom nwa-nne-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 13