10. Amnon we si Tema, Bubata ihe-oriri n'ime-ulo, ka m'we rie ya n'aka-gi. Tema we chiri achicha nke o mere, chitara Amnon nwa-nne-ya n'ime-ulo.
11. Ọ chita ha nso ya ka o rie, Amnon we jide ya, si ya, Bia, sorom dina, nwa-nnem.
12. Ọ si ya, É-è nwa-nnem, ewedalam n'ala; n'ihi na adighi-eme otú a n'Israel: emela ihe-nzuzu a.
13. Ma mu onwem, òle ebe m'gēme ka ita-utam la? ma gi onwe-gi, i gādi ka otù onye nime ndi-nzuzu n'israel. Ma ub͕u a, biko, gwa eze okwu; n'ihi na ọ gaghi-eb͕ochim n'ebe i nọ.
14. Ma ọ kweghi ige nti olu-ya: ọ di kwa ike kari ya, ọ we weda ya n'ala, soro ya dina.
15. Amnon we kpọ ya asì, bú ikpọ-asì di uku ri nne; n'ihi na ikpọ-asì ọ kpọrọ ya di uku kari ihu-n'anya ọ huru. Amnon we si ya, Bilie, la.
16. Ọ si ya, Emela otú a, n'ihi na ihe ọjọ uku a n'izilagam jọrọ njọ kari nke-ọzọ nke i merem. Ma o kweghi ige ya nti.
17. O we kpọ nwa-okorọbia-ya nke nejere ya ozi, si, Biko, si n'ebe m'nọ chupu nwayi a n'èzí, kpachie uzọ n'azu ya.
18. Ma uwe-nwudaa nwere aka di n'aru ya: n'ihi na uwe-nwuda di otú a ka umu-ndinyom eze ndi nāmaghi nwoke nēyi. Onye nējere ya ozi we me ka ọ pua n'èzí, we kpachie uzọ n'azu ya.