Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 13:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e nka gasiri, na Absalom nwa Devid nwere nwa-nne-nwayi mara nma, aha-ya bu Tema; Amnon nwa Devid we hu ya n'anya.

2. O we di Amnon nkpà otú a, na o mere onwe-ya onye aru nādighi ike n'ihi Tema, bú nwa-nne-ya; n'ihi na nwa-ab͕oghọ nāmaghi nwoke ka ọ bu; o we di ike n'anya Amnon ime ya ihe ọ bula.

3. Ma Amnon nwere otù eyì, aha-ya bu Jonadab, nwa Shimea nwa-nne Devid: ma Jonadab bu nwoke mara ihe nke-uku.

4. O we si ya, Gini mere gi onwe-gi nāta aru otú a kwa-ututu, gi nwa eze? ì gaghi-egosim? Amnon we si ya, Tema, bú nwa-nne-nwayi Absalom nwa-nnem, ka mu onwem nāhu n'anya.

5. Jonadab we si ya, Dinakwasi n'ihe-ndina-gi, me onwe-gi onye aru nādighi ike: ma mb͕e nna-gi batara ihu gi, i gāsi ya, Biko, ka Tema, bú nwa-nnem, bata, ka o me kwa ka m'rie nri, ka o dozi kwa ihe-oriri ahu n'anyam, ka m'we hu ya, rie ya n'aka-ya.

6. Amnon we dina, mee onwe-ya onye aru nādighi ike: eze we bata ihu-ya, Amnon we si eze, Biko, ka Tema, bú nwa-nnem, bata, me achicha abua n'anyam, ka m'we rie ha n'aka-ya

7. Devid we zigara Tema ozi n'ulo, si, Biko, je n'ulo Amnon nwa-nne-gi, doziere ya ihe-oriri.

8. Tema we je n'ulo Amnon nwa-nne-ya; ma onye ahu nēdina edina. O we were utu ọka flour agwọrọ agwọ, gwọ ya, me achicha n'anya-ya, sie achicha ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 13