Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 12:3-17 Bible Nso (IGBOB)

3. Ma ob͕eye ahu enweghi ihe ọ bula, ma-ọbughi otù nwa-nne-aturu ntà, nke ọ zutara debe ya ndu: o we nọyere ya, nọye-kwa-ra umu-ya, tolite; n'iberibe ihe-oriri-ya ka ọ nēri, n'iko-ya ka ọ nāṅu kwa, n'obi-ya ka o nēdina kwa, o we ghọrọ ya nwa-nwayi.

4. Onye-ije we biakute ọgaranya ahu, o we rapu iwere anu n'etiti ìgwè ewu na aturu-ya ma-ọbu n'etiti ìgwè ehi-ya, idoziri onye-ije ahu nke biakutere ya, ma o were nwa-nne-aturu nke ob͕eye, doziere nwoke ahu biakutere ya.

5. Iwe Devid we di ọku nke-uku megide nwoke ahu; o we si Netan, Jehova nādi ndu, n'ezie onye kwesiri ọnwu ka nwoke ahu bu nke nēme ihe a:

6. ma nwa-nne-aturu ahu, ọ gākwughachi kwa ya ob͕eye ahu okpukpu anọ, n'ihi na o mere ihe a, na n'ihi na o nweghi ọmiko.

7. Netan we si Devid, Gi onwe-gi ka nwoke ahu bu. Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem tere gi manu ibu eze Israel, Mu onwem naputa-kwa-ra gi n'aka Sọl;

8. M'we nye gi ulo onye-nwe-gi, na ndinyom onye-nwe-gi n'obi-gi, nye kwa gi ulo Israel na nke Juda; ma ọ buru na nke ahu di ntà, M'gātukwasi-kwa-ra gi otú a na otú a.

9. Gini mere i ji lelì okwu Jehova, ime ihe jọrọ njọ n'anya-Ya? i werewo mma-agha tib͕ue Uraia onye Het, nwunye-ya ka i werewo-kwa-ra n'onwe-gi na nwunye; ma ya onwe-ya, i werewo mma-agha umu Amon b͕ue ya.

10. Ma ub͕u a mma-agha agaghi-ewezuga onwe-ya n'ulo-gi rue mb͕e ebighi-ebi; n'ihi na i lelìwom, we kuru nwunye Uraia onye-Het ka ọ ghọrọ gi nwunye.

11. Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ si n'ulo-gi bilie imegide i, M'gāchiri kwa ndinyom-i n'anya-gi nye ibe-gi, ọ gēso kwa ndinyom-i dina n'anya anyanwu a.

12. N'ihi na gi onwe-gi mere ya na nzuzo: ma Mu, onwem gēme ihe a n'iru Israel nile, na n'iru anyanwu.

13. Devid we si Netan, Emehiewom megide Jehova. Netan we si Devid, Jehova emewo kwa ka nmehie-gi gabiga; i gaghi-anwu.

14. Otú ọ di, n'ihi na i mewo ka ndi-iro Jehova kpọlu nkpọlu nke-uku n'okwu a, nwa-nwoke nke amuru gi aghaghi inwu kwa.

15. Netan we la n'ulo-ya.Jehova we tie nwata ahu ihe-otiti, bú nke nwunye Uraia muru nye Devid, o we nāria ọria nke-uku.

16. Devid we riosie Chineke aririọ ike bayere nwata ahu; Devid we nēbu ọnu, ba nime, dina ala ogologo abali nile.

17. Ndi-okenye ulo-ya we bilie n'akuku ya, ime ka o si n'ala bilie: ma o kweghi, o soghi kwa ha ri nri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 12