Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 11:24-27 Bible Nso (IGBOB)

24. Ndi-ọb͕a-uta we si na mb͕idi nāb͕a ndi-orù-gi uta; ufọdu n'etiti ndi-orù eze we nwua, orù-gi, bú Uraia onye Het, anwuwo kwa.

25. Devid we si onye-ozi ahu, Otú a ka i gāsi Joab, Ka ihe a ghara ijọ njọ n'anya-gi, n'ihi na mma-agha nēripia otù onye dika ọ nēripa onye ọzọ: me ka agha-gi di ike megide obodo ahu, kwadà ya: gi me kwa ka ọ di ike.

26. Nwunye Uraia we nu na Uraia, bú di-ya, anwuwo, o we tiere di-ya aka n'obi.

27. Iru-újú ahu we gabiga, Devid we ziga, webata ya n'ulo-ya, o we ghọrọ ya nwunye, muara ya nwa. Ma ihe Devid mere jọrọ njọ n'anya Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 11