Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 10:13-19 Bible Nso (IGBOB)

13. Joab na ndi soro ya we biarue agha ahu nso imegide Siria: ha we b͕alaga n'iru ya.

14. Umu Amon we hu na Siria ab͕alagawo, ha onwe-ha we b͕alaga kwa n'iru Abishai, ba n'obodo. Joab we si n'ebe umu Amon nọ lata, biarue Jerusalem.

15. Siria we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we chikọta onwe-ha n'otù.

16. Hedareza we ziga, me ka Siria ndi nọ n'ofè Osimiri puta: ha we biarue Hilam, Shobak onye-isi usu-ndi-agha Hedareza je-kwa-ra n'iru ha.

17. Ewe gosi Devid; o we chikọta Israel nile, gabiga Jọdan, biarue Hilam. Siria we do onwe-ha n'usoro izute Devid, ha we buso ya agha.

18. Siria we b͕alaga n'iru Israel; Devid we b͕ue n'etiti ndi Siria ndikom nke nnù ub͕ọ-ala na ọgu iri-na-ise, na orú nnú ndi-inyinya uzọ ise; o tib͕u-kwa-ra Shobak, bú onye-isi usu-ndi-agha-ha, o we nwua n'ebe ahu.

19. Eze nile, bú ndi-orù Hedareza, we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we me ka ha onwe-ha na Israel di n'udo, we fè ha òfufè. Siria we tua egwu izọputa umu Amon ọzọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 10