Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 9:32-36 Bible Nso (IGBOB)

32. Jihu we welie iru-ya le anya na window, si, Ònye diyerem? ònye? Onozi abua ma-ọbu atọ we leputa anya n'ebe ọ nọ.

33. Ọ si, Tudanu ya. Ha we tuda ya: ufọdu nime ọbara-ya we fesa na mb͕idi, na n'inyinya-ya: ọ we zọkwasi ya ukwu.

34. Ọ bata, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, si, Biko, Lenu nwayi a aburu ọnu anya nke-ọma, lìe ya: n'ihi na nwa-nwayi eze ka ọ bu.

35. Ha we je ilì ya: ma ha achọtaghi ihe ọ bula di n'aru-ya ma-ọbughi okpokoro-isi-ya, na ukwu-ya abua, na ọbu-aka-ya abua.

36. Ha we biaghachi, gosi ya. Ọ si, Okwu Jehova ka ọ bu, nke O kwuru n'aka orù-Ya, bú Elaija onye Tisbe, si, N'òkè-ala-ubi Jezreel ka nkita gēri anu-aru Jezebel:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 9