Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 9:29-34 Bible Nso (IGBOB)

29. Ma n'arọ nke-iri-na-otù nke Joram nwa Ehab ka Ehazaia malitere ibu eze Juda.

30. Jihu we biarue Jezreel, Jezebel we nu ya; ọ we de ihe-ichọ-nma n'anya-ya abua, me ka isi-ya di nma, lepu anya na window.

31. Mb͕e Jihu bara n'ọnu-uzọ-ama, nwayi ahu siri, Ùdo di kwa, Zimri, ob͕u onye-nwe-ya?

32. Jihu we welie iru-ya le anya na window, si, Ònye diyerem? ònye? Onozi abua ma-ọbu atọ we leputa anya n'ebe ọ nọ.

33. Ọ si, Tudanu ya. Ha we tuda ya: ufọdu nime ọbara-ya we fesa na mb͕idi, na n'inyinya-ya: ọ we zọkwasi ya ukwu.

34. Ọ bata, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, si, Biko, Lenu nwayi a aburu ọnu anya nke-ọma, lìe ya: n'ihi na nwa-nwayi eze ka ọ bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 9