1. Umu ndi-amuma we si Elaisha, Biko, le, ebe ayi onwe-ayi nēbi n'iru gi adikara ayi nkpa.
2. Biko, ka ayi jerue Jọdan, si kwa n'ebe ahu were, nwoke ọ bula otù ntuhie, mere onwe-ayi otù ebe n'ebe ahu, ibiri n'ebe ahu. Ọ si, Jenu.
3. Otù onye we si, Biko, kwere, soro ndi-orù-gi je. Ọ si, Mu onwem gēje.
4. O we so ha je. Ha we biarue Jọdan, b͕utue osisi.
5. O rue, mb͕e otù onye nēb͕utu ntuhie-ya, na anyu-ike dabàra na miri: o we tie nkpu, si, Ewó, onye-nwem! nke ahu bu ihe ariọtara ariọta.
6. Onye nke Chineke we si, Òle ebe ọ dara? Ọ we me ka ọ hu ebe ahu. O we b͕utue otù osisi, tubà ya n'ebe ahu, me ka anyu-ike se n'elu miri.
7. O si, Weliere onwe-gi. O we setia aka-ya, were ya.
8. Ma eze Siria nēbuso Israel agha; o we me ka ndi-orù-ya dua ya ọdu, si, N'ebe di otú a otú a ka ọmuma-ulo-ikwūm gādi.
9. Onye nke Chineke we zigara eze Israel ozi, si, Lezie onwe-gi anya, ka i ghara igabiga ebe ahu; n'ihi na n'ebe ahu ka Siria nāridata.
10. Eze Israel we ziga ozi n'ebe ahu nke onye nke Chineke siri ya dọ kwa ya aka na nti bayere ya; ewe debe ya ndu n'ebe ahu, ọ bughi otù ub͕ò, ọ bughi kwa ub͕ò abua.
11. Ma obi eze Siria anọghi n'otù ebe n'ihi ihe a; o we kpọ ndi-orù-ya, si ha, Ùnu agaghi-egosim onye nime ayi diri eze Israel?
12. Otù onye nime ndi-orù-ya we si, É-è, onye-nwem eze: kama Elaisha, bú onye-amuma nke nọ n'Israel, o nēgosi eze Israel okwu nile nke i nēkwu n'ime-ulo-ndina-gi.
13. Ọ si, Jenu, hu ebe ya onwe-ya nọ, ka m'we ziga kuta ya. Ewe gosi ya, si, Le, ọ nọ na Dotan.
14. O we ziga inyinya na ub͕ọ-ala na oké usu-ndi-agha n'ebe ahu: ha we bia n'abali, je obodo ahu buruburu.
15. Onye nējere onye nke Chineke ozi we bilie n'isi-ututu, pua, ma, le, usu-ndi-agha nāb͕a obodo ahu buruburu, ha na inyinya na ub͕ọ-ala. Nwa-okorọbia-ya we si ya, Ewó, onye-nwem! àyi gēme aṅa?