31. Gihezi we gabiga n'iru ha, tukwasi nkpa-n'aka ahu n'iru nwa-okoro ahu; ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa ọṅuṅa-nti di. O we jeghachi izute ya, gosi ya, si, Nwa-okoro ahu etetaghi.
32. Elaisha we bata n'ulo ahu, ma, le, nwa-okoro ahu anwuwo, atọb͕ọ-kwa-ra ya n'ihe-ndina-ya.
33. O we ba, mechibido ha abua uzọ kpere Jehova.
34. Ọ rigo, dina n'elu nwata ahu, tukwasi ọnu-ya n'ọnu-ya, na anya-ya abua n'anya-ya abua, na ọbu-aka-ya abua n'ọbu-aka-ya abua, ruru ala n'elu ya: anu-aru nwata ahu we di ọku.
35. O we biaghachi, jegharia iru na azu n'ulo otù ub͕ò; ọ rigo, ruru kwa n'elu ya: nwa-okoro ahu we ze uzere rue ub͕ò asa, nwa-okoro we saghe anya-ya abua.
36. Ọ kpọ Gihezi, si, Kpọ nwayi Shunem nka. Ọ kpọ ya. Nwayi ahu we bakute ya, ọ si, Kuru nwa-gi.