Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 4:10-19 Bible Nso (IGBOB)

10. Biko, ka ayi me ime-ulo-elu ntà nke mb͕idi; ka ayi dọba-kwa-ra ya n'ebe ahu ihe-ndina, na table, na oche, na ihe-idọba-oriọna: o gēru kwa, mb͕e ọ biakutere ayi, na ọ gēwezuga onwe-ya ba n'ebe ahu.

11. Ubọchi we rue, na ọ biara n'ebe ahu, wezuga onwe-ya ba n'ime-ulo-elu ahu, dina n'ebe ahu.

12. Ọ si Gihezi, bú nwa-okorọbia-ya, Kpọ nwayi Shunem nka. O we kpọ ya, o we guzo n'iru ya.

13. Elaisha we si Gihezi, Biko, si ya, Le, i werewo ncheb͕u a nile cheb͕u onwe-gi bayere ayi; gini ka agēmere gi? ọ̀ bu igwa eze okwu bayere gi, ma-ọbu igwa onye-isi usu-ndi-agha? Ọ si, N'etiti ndim ka mu onwem nēbi.

14. Ọ si, Gini kwa ka agēmere ya? Gihezi we si, N'ezie ọ nweghi nwa-nwoke, di-ya aghọwo kwa agadi.

15. Ọ si, Kpọ ya. O we kpọ ya, nwayi ahu we guzo n'ọnu-uzọ.

16. Ọ si, Na mb͕e nka akara àkà, dika mb͕e a aka-nile, gi onwe-gi ganāb͕aku nwa-nwoke. Ọ si, É-è, onye-nwem, gi onye nke Chineke, agwala orù-gi nwayi okwu-ugha.

17. Nwayi ahu we turu ime, mua nwa-nwoke na mb͕e ahu akara àkà, dika mb͕e ahu aka-nile, otú Elaisha gwara ya.

18. Nwata ahu we toputa, ubọchi we rue, na ọ pukuru nna-ya jekuru ndi nēbì ọka.

19. Ọ si nna-ya, Isim, isim. O we si nwa-okorọbia-ya, Kuru ya bakuru nne-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 4