Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 3:3-15 Bible Nso (IGBOB)

3. Otú ọ di, ọ rapara na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o ji me ka Israel mehie; o wezugaghi onwe-ya nime ya.

4. Ma Misha, bú eze Moab, bu onye-nwe ìgwè anu-ulo; o we tuara eze Israel utu aji nke orú nnù umu-aturu uzọ iri-na-abua na nnù iri, na nke orú nnù ebulu uzọ iri-na-abua na nnù iri.

5. O rue, mb͕e Ehab nwuru, na eze Moab jehiere megide eze Israel.

6. Eze, bú Jehoram, we si na Sameria pua n'ubọchi ahu, gukọta Israel nile.

7. O je kwa, zigara Jehoshafat, bú eze Juda, ozi, si, Eze Moab ejehiewo megidem: ì gēsorom jekuru Moab ibu agha? Ọ si, M'gārigo: dika m'di, otú a ka i di; dika ndim di, otú a ka ndi-gi di; dika inyinyam di, otú a ka inyinya-gi di.

8. Ọ si, Òle nke bu uzọ ayi gēsi rigo? Ọ si, Uzọ ọzara Edom.

9. Eze Israel we je, ya na eze Juda, na eze Edom: ha we ga ije ubọchi asa buruburu: ma ọ dighi miri diri ọmuma-ulo-ikwū ahu, ma ọbu nke diri anu-ulo nke ha chiri je.

10. Eze Israel we si, Ewó! n'ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n'aka Moab.

11. Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ ebe a, ka ayi we jua Jehova ase site n'aka-ya? Otù nime ndi-orù eze Israel we za, si, Elaisha nwa Shefat nọ ebe a, onye wukwasiri miri n'aka Elaija.

12. Jehoshafat we si, Okwu Jehova di n'ebe ọ nọ. Eze Israel na Jehoshafat na eze Edom we ridakuru ya.

13. Elaisha we si eze Israel, Gini ka mu na gi nwekọrọ? jekuru ndi-amuma nna-gi, jekuru kwa ndi-amuma nne-gi. Eze Israel we si ya, É-è: n'ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n'aka Moab.

14. Elaisha we si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, n'ezie, ọ buru na ahughm Jehoshafat, bú eze Juda, iru-ọma, m'gaghi-elegide anya n'ebe i nọ ma-ọli, m'gaghi-ahu kwa gi anya ma-ọli.

15. Ma ub͕u a kutaranum ọkpọ-ubọ. O rue, mb͕e ọkpọ-ubọ ahu nākpọ, na aka Jehova di n'aru ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 3