Elaisha we si eze Israel, Gini ka mu na gi nwekọrọ? jekuru ndi-amuma nna-gi, jekuru kwa ndi-amuma nne-gi. Eze Israel we si ya, É-è: n'ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n'aka Moab.