Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 20:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n'ihi na gi onwe-gi nānwu anwu, i gaghi-adi kwa ndu.

2. O we chigharia iru-ya che mb͕idi iru, kpere Jehova, si,

3. Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku.

4. O rue, mb͕e Aisaia akāpughi ba n'etiti obodo, na okwu Jehova ruru ya nti, si,

5. Jeghachi, si Hezekaia, bú onye-ndú ndim, Otú a ka Jehova, bú Chineke Devid nna-gi, siri, Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M'nēme ka aru-gi di ike: n'ubochi nke-atọ i gārigoru ulo Jehova.

6. M'gātukwasi kwa arọ iri na ise n'ubọchi-gi, naputa kwa gi na obodo a n'ọbu-aka eze Asiria, b͕ochi kwa obodo a n'ihi Onwem na n'ihi Devid, bú orùm.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 20