Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 18:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, n'arọ nke-atọ nke Hoshea nwa Ila, bú eze Israel, na Hezekaia nwa Ehaz, bú eze Juda, malitere ibu eze.

2. Orú arọ na ise ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iteghete nime Jerusalem: aha nne-ya bu Abi nwa-nwayi Zekaraia.

3. O me ihe ezi ziri n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Devid nna-ya mere.

4. Ya onwe-ya wezugara ebe nile di elu, titue ogidi nile, b͕utue Ashera: o tipia-kwa-ra agwọ ọla nke Moses mere; n'ihi na rue mb͕e ahu umu Israel nēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; o we kpọ ya Nehushtan.

5. Ọ bu na Jehova, bú Chineke Israel, ka ọ tukwasiri obi; mb͕e ọ nwusiri ọ dighi kwa onye ọzọ di ka ya n'etiti eze nile nke Juda, ma-ọbu n'etiti ndi buru ya uzọ.

6. O we rapara Jehova n'aru, o sighi n'iso Ya wezuga onwe-ya, o we debe ihe nile O nyere n'iwu, bú nke Jehova nyere Moses n'iwu.

7. Jehova nọye-kwa-ra ya; n'ebe o bula ọ nāpu o nwere uche: o we nupu isi n'okpuru eze Asiria, o fèghi kwa ya òfùfè.

8. Ya onwe-ya tib͕uru ndi Filistia rue Geza na ókè-ala-ya nile, site n'ulo-elu ndi nēche nche rue obodo ewusiri ike.

9. O rue, n'arọ nke-anọ nke eze, bú Hezekaia, nke ahu bu arọ nke-asa nke Hoshea nwa Ila, bú eze Israel, na Shalmanesa, bú eze Asiria, rigoro imegide Sameria, nọchigide ya n'agha.

10. Ha we were ya n'ọgwugwu arọ atọ: ọ bu n'arọ nke-isi nke Hezekaia, nke ahu bu arọ nke-iteghete nke Hoshea, bú eze Israel, ka ewere Sameria.

11. Eze Asiria we me ka Israel je biri n'Asiria, o we me ka ha nọdu nime Hala na nime Haboa, n'osimiri Gozan, na n'obodo ndi Midia:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 18