Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 17:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. N'arọ nke-iri-na-abua nke Ehaz, bú eze Juda, ka Hoshea nwa Ila malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ iteghete.

2. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, nání na o meghi dika ndi-eze Israel ndi buru ya uzọ.

3. Ya ka Shalmanesa, bú eze Asiria, rigoro imegide; Hoshea we ghọ orù-ya, butere ya onyinye-inata-iruọma.

4. Eze Asiria we hu nkekọta-madu imegide ya n'aru Hoshea; n'ihi na o zigara So, bú eze Ijipt, ndi-ozi, ma o bugoghi onyinye-inata-iru-ọma inye eze Asiria, dika ọ nēme kwa-arọ: eze Asiria we mechibido ya, ke ya ab͕u n'ulo-nkpọrọ.

5. Eze Asiria we rigo n'ala ahu nile, rigorue Sameria, nọchigide ya n'agha arọ atọ.

6. N'arọ nke-iteghete nke Hoshea ka eze Asiria were Sameria, me ka Israel je biri n'Asiria, me ka ha biri nime Hala, na nime Haboa, n'osimiri Gozan, na n'obodo ndi Midia.

7. O rue, n'ihi na umu Israel mehiere megide Jehova, bú Chineke-ha, Onye nēme ka ha si n'ala Ijipt, si n'okpuru aka Fero, bú eze Ijipt, rigoputa, n'ihi na ha tu-kwa-ra egwu chi di iche iche ọzọ,

8. we jeghari n'ukpuru nile nke mba ọzọ, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel, na n'ukpuru ndi-eze Israel, nke ha mere.

9. Umu Israel we were nzuzo me ihe nke nēzighi ezi megide Jehova, bú Chineke-ha, ha we wuere onwe-ha ebe di elu n'obodo-ha nile, site n'ulo-elu ndi nēche nche rue obodo ewusiri ike.

10. Ha guzo-kwa-ra ogidi na Asherim nye onwe-ha n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula:

11. ha we sure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe ahu n'ebe nile di elu, dika mba ọzọ mere, bú ndi Jehova mere ka ha je biri n'ala ọzọ n'iru ha; ha me-kwa-ra ihe ọjọ di iche iche ikpasu Jehova iwe:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 17