Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 9:20-31 Bible Nso (IGBOB)

20. Ihe nile eze, bú Solomon, nwere, bú nke eji aṅu ihe, bu ọla-edo, ihe nile nke ulo oké ọhia Lebanon bu kwa ọla-edo makarisiri nma: agughi ọla-ọcha n'ihe ọ bula n'ubọchi Solomon.

21. N'ihi na eze nwere ub͕ọ-nke nējeru Tashish nēso ndi-orù Huram: otù ub͕ò n'arọ atọ ka ub͕ọ Tashish nābia, nēbute ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọdu, na enwe, na ekwuru-ulo.

22. Eze, bú Solomon, we di uku kari eze nile nke uwa n'àkù na amam-ihe.

23. Eze nile nke uwa we nāchọ iru Solomon, inu amam-ihe-ya, nke Chineke tiyere n'obi-ya.

24. Ndi ahu nēbute kwa, nwoke ọ bula onyinye-inata-iru-ọma-ya, ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, na ihe-ekike-agha, na uda di iche iche, na inyinya, na inyinya mule, ihe anēnye n'arọ n'arọ-ya.

25. Solomon nwe-kwa-ra nnù ulo iri nke inyinya na ub͕ọ-ala, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri, o we do ha n'obodo ub͕ọ-ala nile, na n'ebe eze nọ na Jerusalem.

26. O we nāchi eze nile site n'Osimiri rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt.

27. Eze we me ọla-ọcha ka ọ di ka nkume nime Jerusalem, o me-kwa-ra osisi cedar ka ha di ka osisi sycomore nke di n'ebe di ala ala n'uba.

28. Anēme kwa ka inyinya si n'Ijipt, si kwa n'ala nile, putara Solomon.

29. Ma ihe nile Solomon mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, èdeghi ihe ndia n'akwukwọ ihe emere nke Netan, bú onye-amuma, na n'obubu-amuma nke Ahaija, bú onye Shailo, na n'ọhù nile nke Ido, bú onye-ọhu-uzọ, bayere Jeroboam nwa Nebat?

30. Solomon we buru eze Israel nile nime Jerusalem ọgu arọ abua.

31. Solomon we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid, bú nna-ya: Rehoboam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 9