Huram we zitere ya ub͕ọ na ndi-orù ndi mara oké osimiri n'aka ndi-orù-ya; ha na ndi-orù Solomon we biarue Ofia, si n'ebe ahu weta nnù talent ọla-edo na ọgu abua na iri, wetara eze, bú Solomon.