Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 8:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, n'ọgwugwu orú arọ, nke Solomon wuru ulo Jehova na ulo-ya nime ha,

2. na obodo nile nke Huram nyere Solomon, Solomon we wue ha, me ka umu Israel biri n'ebe ahu.

3. Solomon we jerue Hemat-zoba, were ya.

4. O we wue Tadmoa n'ọzara, na obodo nile nke nchikọbata-ihe, nke o wuru na Hemat.

5. O wu-kwa-ra Bet-horon di n'elu, na Bet-horon di n'okpuru, bú obodo ewusiri ike, nke nwere mb͕idi, na ibo-ọnu-uzọ-ama siri ike, na nkpọrọ;

6. na Bealat, na obodo nile nke nchikọbata-ihe nke Solomon nwere, na obodo nile nke ub͕ọ-ala-ya, na obodo nile nke ndi-inyinya-ya, na ihe nile di Solomon ezi nma n'obi, bú nke di ya ezi nma n'obi iwu na Jerusalem, na nime Lebanon, na n'ala nile ọ nāchi.

7. Ma ndi nile fọduru n'etiti ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, ndi nēsiteghi n'Israel;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 8