Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 7:8-21 Bible Nso (IGBOB)

8. Solomon we me ememe na mb͕e ahu ubọchi asa, ya na Israel nile, oké nkpọkọta uku, site na nbata Hemat rue miri-iyi Ijipt.

9. Ha we me ememe nb͕ochi n'ubọchi nke-asatọ: n'ihi na ha mere ememe ira ebe-ichu-àjà nye Chineke ubọchi asa, me kwa ememe ahu ubọchi asa.

10. N'ubọchi nke-orú-na-atọ nke ọnwa nke-asa o we zilaga ndi Israel n'ulo-ikwū-ha, ha nāṅuri ọṅu, obi di kwa ha nma, n'ihi ezi ihe nke Jehova mere Devid, me-kwa-ra Solomon, me-kwa-ra Israel, bú ndi-Ya.

11. Solomon we wubìe ulo Jehova, na ulo eze: ma ihe nile nke batara n'obi Solomon ime n'ulo Jehova na n'ulo-ya, o mere ka ha ga nke-ọma.

12. Jehova we me ka Solomon hu Ya anya n'abali, Ọ si ya, Anuwom ekpere-gi, rọputa-kwa-ra Onwem ebe a ibu ulo ichu àjà.

13. Asi na eb͕ochim elu-igwe, miri-ozuzo we ghara idi, ma-ọbu asi na enyem igurube iwu iripia ala, ma-ọbu asi na ezitem ajọ ọria nēfe efe n'etiti ndim;

14. ọ buru na ndim, bú ndi akpọkwasiri ha aham, eweda onwe-ha n'ala, kpe ekpere, chọ irum, si n'uzọ ọjọ ha nile laghachi; Mu onwem gēsi kwa n'elu-igwe nuru, b͕aghara ha nmehie-ha, me ka ala-ha diri ndu.

15. Ub͕u a anyam abua ganāsaghe, ntim abua ganāṅa kwa nti, n'ekpere nke ebe a.

16. Ma ub͕u a arọputawom ulo a, do kwa ya nsọ, ka aham we di n'ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi: anyam abua na obim gādi kwa n'ebe ahu ubọchi nile.

17. Ma gi onwe-gi, ọ buru na i jegharia n'irum, dika Devid, bú nna-gi, jeghariri, ọbuná ime dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu, ọ buru na i debe ukpurum nile na ikpém nile;

18. M'gēme kwa ka oche-eze ala-eze-gi guzosie ike, dika Mu na Devid, bú nna-gi, b͕ara ndu, M'we si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'ichi Israel.

19. Ma ọ buru na unu onwe-unu alaghachi azu, we rapu ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu, nke M'tiyeworo n'iru unu, unu we je fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha:

20. M'gēropu kwa ha n'elu alam nke M'nyeworo ha; M'gēsi kwa n'irum tupu ulo a, nke M'doworo nsọ nye aham, M'gēme kwa ya ilu na ihe-àkùkù n'etiti ndi ọzọ nile.

21. Ulo a kwa, nke kachasi elu, o gēju onye ọ bula nke nāgabiga ya anya, ọ gāsi kwa, N'ìhi gini ka Jehova meworo ala nka na ulo a otú a?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 7