Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 7:6-11 Bible Nso (IGBOB)

6. Ndi-nchu-àjà nēguzo kwa, dika ihe-ndebe-ha si di; ha na ndi Livai, ndi chiri ihe abù Jehova, nke Devid, bú eze, mere ikele Jehova, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di, mb͕e Devid nēto Chineke site n'aka-ha: ndi-nchu-àjà nāfù kwa opì n'iru ha; Israel nile nēguzo kwa.

7. Solomon we do etiti ogige nke di n'iru ulo Jehova nsọ; n'ihi na ọ churu àjà-nsure-ọku na abuba àjà-udo n'ebe ahu: n'ihi na ebe-ichu-àjà ọla nke Solomon mere apughi inagide àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, na abuba ahu.

8. Solomon we me ememe na mb͕e ahu ubọchi asa, ya na Israel nile, oké nkpọkọta uku, site na nbata Hemat rue miri-iyi Ijipt.

9. Ha we me ememe nb͕ochi n'ubọchi nke-asatọ: n'ihi na ha mere ememe ira ebe-ichu-àjà nye Chineke ubọchi asa, me kwa ememe ahu ubọchi asa.

10. N'ubọchi nke-orú-na-atọ nke ọnwa nke-asa o we zilaga ndi Israel n'ulo-ikwū-ha, ha nāṅuri ọṅu, obi di kwa ha nma, n'ihi ezi ihe nke Jehova mere Devid, me-kwa-ra Solomon, me-kwa-ra Israel, bú ndi-Ya.

11. Solomon we wubìe ulo Jehova, na ulo eze: ma ihe nile nke batara n'obi Solomon ime n'ulo Jehova na n'ulo-ya, o mere ka ha ga nke-ọma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 7