Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 6:4-22 Bible Nso (IGBOB)

4. Ọ si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye were ọnu-Ya gwa Devid, bú nnam, okwu, were kwa aka-Ya abua mezue ya, si,

5. Site n'ubọchi mb͕e M'mere ka ndim si n'ala Ijipt puta, arọputaghm obodo n'ebo nile nke Israel iwu ulo, ka aham we di n'ebe ahu; arọputaghkwam nwoke ọ bula ibu onye-ndú ndim, bú Israel:

6. ma arọputaram Jerusalem, ka aham we di n'ebe ahu; arọputa-kwa-ram Devid ibu onye-isi ndim, bú Israel.

7. O we di n'obi Devid, bú nnam, iwuru aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo.

8. Jehova we si Devid, bú nnam, N'ihi na ọ di n'obi-gi iwuru aham ulo, i mere nke-ọma na ọ di n'obi-gi:

9. otú ọ di gi onwe-gi agaghi-ewu ulo ahu; kama, nwa-gi nwoke nke nēsi n'úkwù-gi puta, onye ahu gēwuru aham ulo.

10. Jehova emewo kwa ka okwu-Ya nke O kwuru guzosie ike; m'we bilie n'ọnọdu Devid, bú nnam, nọkwasi n'oche-eze Israel, dika Jehova kwuru, m'we wuere aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo,

11. dọba ib͕e ahu n'ebe ahu, bú ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu Jehova di n'ebe ahu, bú ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na umu Israel b͕ara.

12. O we guzo n'iru ebe-ichu-àjà Jehova n'iru nkpọkọta nile nke Israel, we b͕asa ọbu-aka-ya abua:

13. (n'ihi na Solomon mere ebe-nguzo di elu nke ọla-cubit ise ka ogologo-ya di, cubit ise ka obosara-ya di kwa, cubit atọ ka idi-elu, ya di kwa, o we tiye ya n'etiti ogige; o we guzo n'elu ya, b͕u ikperè-ya n'ala n'iru nkpọkọta nile nke Israel, b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe elu-igwe di:)

14. ọ si, Jehova, bú Chineke Israel, ọ dighi Chineke dika Gi, n'elu-igwe, ma-ọbu n'uwa; I nēdebere ndi-orù-Gi ọb͕ub͕a-ndu na ebere, bú ndi were obi-ha nile nējeghari n'iru Gi:

15. I debeworo orù-Gi Devid, bú nnam, ihe I gwara ya: I we were ọnu-Gi kwue, were kwa aka-Gi mezue ya, otú ọ di ta.

16. Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, debere orù-Gi Devid, bú nnam, okwu nke I gwaworo ya, si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'irum n'inọkwasi n'oche-eze Israel; nání ọ buru na umu-gi elezi uzọ-ha anya, ijeghari n'iwum dika i jeghariworo n'irum.

17. Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, ka okwu-Gi kwesi ntukwasi-obi, nke I gwara orù-Gi, bú Devid.

18. Ma ọ̀ bu ezie na Chineke gēbiyere madu n'elu uwa? le, elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe agaghi-anagide Gi; ulo a nke m'wuworo, ò gēsi kwa aṅa rue inagide Gi?

19. Ma che iru n'ekpere orù-Gi, na n'aririọ-amara-ya, Jehova, bú Chinekem, ige nti iti-nkpu na ekpere orù-Gi nēkpe n'iru Gi:

20. ka anya-Gi abua we nāsaghe n'ebe ulo a di ehihie na abali, bú n'ebe ebe ahu di nke I siworo na I gētiye aha-Gi n'ebe ahu; ige nti ekpere nke orù-Gi gēkpe n'ebe ebe a di.

21. Ge kwa nti aririọ-amara nile nke orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, mb͕e ha nēkpe ekpere n'ebe ebe a di: Gi onwe-gi si kwa n'ebe obibi-Gi, bú site n'elu-igwe, nuru; mb͕e I nuworo, Gi b͕aghara kwa.

22. Ọ buru na nwoke emehie megide madu-ibe-ya, ewe tukwasi ya iyi ime ka ọ ṅua, iyi ahu we bia n'iru ebe-ichu-àjà-Gi n'ulo a:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 6