Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 4:4-13 Bible Nso (IGBOB)

4. O nēguzo n'elu ehi iri na abua, atọ nēche iru n'Ugwu, atọ nēche iru n'Ọdida-anyanwu, atọ nēche iru na Ndida, atọ nēche iru n'Ọwuwa-anyanwu: oké osimiri ahu we dikwasi ha n'elu, azu-ha nile di kwa nime.

5. Ib͕idi-ya di otù ntù-ọbu-aka; emere ọnu-ya dika anēme ọnu iko, dika okoko urodi: ọ nānara nagide kwa nnù bath asa na ọgu iri.

6. O me-kwa-ra ite ọsisa-miri iri, tiye ise n'aka-nri, na ise n'aka-ekpe, iji sa anu; ihe diri àjà-nsure-ọku ka ha nāṅacha nime ha: ma oké osimiri ahu diri ndi-nchu-àjà iji sa aru.

7. O me kwa ihe-idọba-oriọna iri nke ọla-edo dika ikpé-ha si di; o tiye ha n'ulo uku Chineke, ise n'aka-nri, na ise n'aka-ekpe.

8. O me kwa table iri, dọba ha n'ulo uku Chineke, ise n'aka-nri, na ise n'aka-ekpe. O me kwa ọgu ọkwa-nwusa ise nke ọla-edo.

9. O me kwa ogige ndi-nchu-àjà, na ogige uku ahu, na ibo-ọnu-uzọ itiye n'ogige ahu, were ọla machita ibo-ọnu-uzọ-ha.

10. O tiye oké osimiri ahu n'akuku aka-nri ulo ahu n'akuku Iru-anyanwu na ncherita-iru Ndida.

11. Huram me-kwa-ra ite nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile. Huram we jebìe ozi nke o jere eze, bú Solomon, n'ulo Chineke:

12. ogidi abua ahu, na ọkwa abua ahu, na isi abua ahu nke di n'elu ogidi abua; na ihe-ọkpukpa abua ahu ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n'elu ogidi;

13. na nnù pomegranate ahu nke diri ihe-ọkpukpa abua ahu; bú ariri pomegranate abua bayere otù ihe-ọkpukpa, ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n'iru ogidi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 4