Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 4:3-11 Bible Nso (IGBOB)

3. Oyiyi ehi di kwa n'okpuru ya, ndi nọ ya buruburu buruburu, ha di cubit iri, nāb͕a oké osimiri ahu buruburu. Ehi ahu di iri na abua, awuru mb͕e awuru ya.

4. O nēguzo n'elu ehi iri na abua, atọ nēche iru n'Ugwu, atọ nēche iru n'Ọdida-anyanwu, atọ nēche iru na Ndida, atọ nēche iru n'Ọwuwa-anyanwu: oké osimiri ahu we dikwasi ha n'elu, azu-ha nile di kwa nime.

5. Ib͕idi-ya di otù ntù-ọbu-aka; emere ọnu-ya dika anēme ọnu iko, dika okoko urodi: ọ nānara nagide kwa nnù bath asa na ọgu iri.

6. O me-kwa-ra ite ọsisa-miri iri, tiye ise n'aka-nri, na ise n'aka-ekpe, iji sa anu; ihe diri àjà-nsure-ọku ka ha nāṅacha nime ha: ma oké osimiri ahu diri ndi-nchu-àjà iji sa aru.

7. O me kwa ihe-idọba-oriọna iri nke ọla-edo dika ikpé-ha si di; o tiye ha n'ulo uku Chineke, ise n'aka-nri, na ise n'aka-ekpe.

8. O me kwa table iri, dọba ha n'ulo uku Chineke, ise n'aka-nri, na ise n'aka-ekpe. O me kwa ọgu ọkwa-nwusa ise nke ọla-edo.

9. O me kwa ogige ndi-nchu-àjà, na ogige uku ahu, na ibo-ọnu-uzọ itiye n'ogige ahu, were ọla machita ibo-ọnu-uzọ-ha.

10. O tiye oké osimiri ahu n'akuku aka-nri ulo ahu n'akuku Iru-anyanwu na ncherita-iru Ndida.

11. Huram me-kwa-ra ite nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile. Huram we jebìe ozi nke o jere eze, bú Solomon, n'ulo Chineke:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 4