Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 4:13-22 Bible Nso (IGBOB)

13. na nnù pomegranate ahu nke diri ihe-ọkpukpa abua ahu; bú ariri pomegranate abua bayere otù ihe-ọkpukpa, ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n'iru ogidi.

14. O me-kwa-ra ihe-ndọkwasi iri ahu, me kwa ite ọsisa-miri iri ahu nke di n'elu ihe-ndọkwasi;

15. na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua ahu nke di n'okpuru ya.

16. Na ite nile, na osekè nile, na ndudu nile, na ihe-ha nile, ndia ka Huram nna-ya mere eze, bú Solomon, bayere ulo Jehova, ha bu ọla echichara echicha.

17. Na buruburu-ala Jọdan ka eze wuru ha, n'ala urọ n'etiti Sukot na Zerida.

18. Solomon we me ihe ndia nile n'uba nke-uku: n'ihi na achọputaghi ọtùtù ọla ahu.

19. Solomon me-kwa-ra ihe nile nke di n'ulo Chineke, ebe-ichu-àjà ọla-edo kwa, na table nke achicha iru Chineke di n'elu ha;

20. na ihe-idọba-oriọna na oriọna nile ha, inwu enwu dika ikpé si di n'iru ime-ime-ulo ahu, ha bu ọla-edo makarisiri nma;

21. na okoko-osisi nile, na oriọna nile, na nkpa nile, ha bu ọla-edo, nke ahu bu ọla-edo dizu nma;

22. na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe-igu-ọku nile, ha bu ọla-edo makarisiri nma: ọnu-uzọ ulo ahu kwa, ibo-ọnu-uzọ ime-ime ya nile nke diri ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, na ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo ahu, bú ulo uku Chineke, bu ọla-edo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 4