10. O tiye oké osimiri ahu n'akuku aka-nri ulo ahu n'akuku Iru-anyanwu na ncherita-iru Ndida.
11. Huram me-kwa-ra ite nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile. Huram we jebìe ozi nke o jere eze, bú Solomon, n'ulo Chineke:
12. ogidi abua ahu, na ọkwa abua ahu, na isi abua ahu nke di n'elu ogidi abua; na ihe-ọkpukpa abua ahu ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n'elu ogidi;
13. na nnù pomegranate ahu nke diri ihe-ọkpukpa abua ahu; bú ariri pomegranate abua bayere otù ihe-ọkpukpa, ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n'iru ogidi.