Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 4:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. O me-kwa-ra ebe-ichu-àjà ọla, orú cubit ka ogologo-ya di, orú cubit ka obosara-ya di kwa, cubit iri ka idi-elu-ya di kwa.

2. O me-kwa-ra oké osimiri awuru awu, cubit iri site n'otù ọnu-ya rue ọnu-ya nke-ọzọ, ọ di buruburu buruburu, cubit ise ka idi-elu-ya di; eriri nke orú cubit na iri b͕a-kwa-ra ya buruburu.

3. Oyiyi ehi di kwa n'okpuru ya, ndi nọ ya buruburu buruburu, ha di cubit iri, nāb͕a oké osimiri ahu buruburu. Ehi ahu di iri na abua, awuru mb͕e awuru ya.

4. O nēguzo n'elu ehi iri na abua, atọ nēche iru n'Ugwu, atọ nēche iru n'Ọdida-anyanwu, atọ nēche iru na Ndida, atọ nēche iru n'Ọwuwa-anyanwu: oké osimiri ahu we dikwasi ha n'elu, azu-ha nile di kwa nime.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 4