isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 36 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndi ala ahu we kuru Jehoahaz nwa Josaia, me ya eze n'ọnọdu nna-ya nime Jerusalem.

2. Joahaz b͕ara orú arọ na atọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọnwa atọ nime Jerusalem.

3. Eze Ijipt we wezuga ya nime Jerusalem, rie ala ahu nra ọgu talent ọla-ọcha ise na otù talent ọla-edo.

4. Eze Ijipt we me Elaiakim, bú nwa-nne-ya, eze Juda na Jerusalem, gugharia ya aha Jehoiakim. Neko we were Joahaz nwa-nne-ya, me ka ọ biarue Ijipt.

5. Jehoiakim b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ya.

6. Nebukadneza, bú eze Babilon, we rigota imegide ya, were ihe ọla eji ke ukwu ab͕u ke ya ab͕u, ime ka o jerue Babilon.

7. Nebukadneza we chiri ufọdu n'ihe ulo Jehova chibata na Babilon, o tiye ha n'ulo uku ya nime Babilon.

8. Ma ihe nile Jehoiakim mere nke fọduru, na ihe-árú-ya nile nke o mere, na ihe achọputaworo imegide ya, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Israel na Juda: Jehoiakin nwa-ya we buru eze n'ọnọdu-ya.

9. Jehoiakin b͕ara arọ asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze ọnwa atọ na ubọchi iri nime Jerusalem: o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.

10. Ma n'ọb͕ub͕a arọ, eze, bú Nebukadneza, zìri, me ka ọ biarue Babilon, ya na ihe nile anāchọsi ike nke ulo Jehova, o we me Zedakaia, bú nwa-nne-ya, eze Juda na Jerusalem.

11. Zedekaia b͕ara orú arọ na otù mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem:

12. o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ya; o rurughi ala n'iru Jeremaia, bú onye-amuma, onye nēkwu okwu site n'ọnu Jehova.

13. Ọzọ kwa, o nupuru isi n'okpuru eze, bú Nebukadneza, onye mere ka o were Chineke ṅua iyi: o we kwesie olu-ya ike, b͕a obi-ya ume, ka ọ ghara ichigharikute Jehova, bú Chineke Israel.

14. Ndi-isi nile nke ndi-nchu-àjà, na ndi Juda, mekpu-kwa-ra ihe-nmekpu ri nne, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di; ha we merua ulo Jehova nke O doro nsọ nime Jerusalem.

15. Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, we zigara ha ozi n'aka ndi-ozi-Ya, nēbili n'isi-ututu, nēzì kwa; n'ihi na O nwere ọmiko n'aru ndi-Ya na n'ebe ebe-obibi-Ya di:

16. ha we nēme ndi-ozi Chineke ka ha buru ihe-ọchì, ha nēlelì kwa okwu-Ya anya, nēme kwa onwe-ha ndi-aghughọ n'ebe ndi-amuma-Ya nọ, rue mb͕e ọnuma Jehova lara elu imegide ndi-Ya, rue mb͕e ngwọta nādighi.

17. O we me ka eze Kaldea rigokwasi ha, o we were mma-agha b͕ue umu-okorọbia-ha n'ulo ebe nsọ ha, o nweghi kwa ọmiko n'aru nwa-okorọbia, ma ọbu n'aru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ma-ọbu n'aru okenye, ma-ọbu n'aru onye kara nká: ha nile ka O nyere n'aka-ya.

18. Ihe nile nke ulo Chineke, ihe uku na ihe ntà, na àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke eze na ndi-isi-ya; ihe ndia nile ka ọ chibatara na Babilon.

19. Ha we sure ulo Jehova ọku, kwatu kwa mb͕idi Jerusalem, sure kwa ulo-elu-ya nile n'ọku, na ihe-ya nile anāchọsi ike, ibibi ha.

20. O me ndi fọduru site na mma-agha ka ha je biri na Babilon; ha we ghọrọ ya, ghọ-kwa-ra umu-ya, ndi-orù rue ọbubu-eze ala-eze Peasia:

21. imezu okwu Jehova nke sitere n'ọnu Jeremaia, rue mb͕e ubọchi-izu-ike-ya nile tọsiri ala ahu utọ: ubọchi nile nke ntọb͕ọrọ-n'efu-ya ọ kwusiri ọlu, imezu ọgu arọ atọ na iri.

22. Ma n'arọ mbu nke Sairọs, bú eze Peasia, ka okwu Jehova nke sitere n'ọnu Jeremaia we rè, Jehova kpọtere mọ nke Sairọs, bú eze Peasia, o we kwusa n'ala-eze-ya nile, ọzọ kwa, o tiyere ya n'odide-akwukwọ, si,

23. Otú a ka Sairọs, bú eze Peasia, siri, Ala-eze nile nke uwa ka Jehova, bú Chineke elu-igwe, nyeworom; Ya onwe-ya me-kwa-ram ka m'buru onye-nlekọta n'iwuru Ya ulo nime Jerusalem, nke di na Juda. Ònye nọ n'etiti unu site na ndi-Ya nile? ka Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya, ya rigo kwa.