Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 34:14-19 Bible Nso (IGBOB)

14. Ma mb͕e ha nēweputa ego ahu nke anēwebata n'ulo Jehova, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, chọtara akwukwọ iwu Jehova nke enyere site n'aka Moses.

15. Hilkaia we za, si Shefan, bú ode-akwukwọ, Achọtawom akwukwọ iwu ahu n'ulo Jehova. Hilkaia we nye Shefan akwukwọ ahu.

16. Shefan we būru akwukwọ ahu biakute eze, ọzọ kwa, o weghachiri eze okwu, si, Ihe nile enyere n'aka ndi-orù-gi, ha nēme ya.

17. Ha awupuwo kwa ego nke anāchọta n'ulo Jehova, ha we nye ya n'aka ndi-nlekọta ahu, na n'aka ndi nēje ozi ahu.

18. Shefan, bú ode-akwukwọ, we gosi eze, si, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, enyewom otù akwukwọ. Shefan we gua ya n'iru eze.

19. O rue, mb͕e eze nuru okwu nile nke iwu ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 34