Ma ub͕u a unu ekwela Hezekaia rafue unu, kpali kwa unu otú a, unu ekwe-kwa-la ya: n'ihi na ọ dighi chi ọ bula nke mba ọ bula ma-ọbu ala-eze ọ bula puru inaputa ndi-ya n'akam, ma-ọbu n'aka nnam-hà: n'ezie Chineke-unu agaghi-anaputa kwa unu n'akam.