Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 30:25-27 Bible Nso (IGBOB)

25. Ha we ṅuria, bú nkpọkọta nile nke Juda, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na nkpọkọta nile ndi nēsi n'Israel bia, na ndi-ọbìa ndi nēsi n'ala Israel bia, ndi nēbi kwa na Juda.

26. Ọṅù uku we di na Jerusalem: n'ihi na site n'ubọchi Solomon nwa Devid, bú eze Israel, ihe dika nka adighi nime Jerusalem.

27. Ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, we bilie gọzie ndi ahu: ewe nu olu-ha, ekpere-ha we biarue ebe-obibi-Ya di nsọ, rue elu-igwe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 30