Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 3:8-11 Bible Nso (IGBOB)

8. O me-kwa-ra ulo nsọ kachasi ulo nsọ nile; ogologo-ya di orú cubit, n'iru obosara ulo ahu, obosara-ya di kwa orú cubit: o were ezi ọla-edo, ra ka nnù talent na ọgu iri, kpuchie ya.

9. Ọtùtù ǹtú-ya nile di ọgu shekel ọla-edo abua na iri. O were kwa ọla-edo kpuchie ime-ulo-elu nile.

10. O me kwa cherubim abua, bú ihe emere dika ihe apiri api, n'ulo nsọ ahu kachasi ulo nsọ nile; ha machita ha ọla-edo.

11. Ma nkù cherubim ahu, ogologo-ha di orú cubit: nkù otù cherub di cubit ise, nēmetu mb͕idi ulo ahu; nkù-ya nke-ọzọ di kwa cubit ise, nēmetu nkù cherub nke-ọzọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 3