10. O me kwa cherubim abua, bú ihe emere dika ihe apiri api, n'ulo nsọ ahu kachasi ulo nsọ nile; ha machita ha ọla-edo.
11. Ma nkù cherubim ahu, ogologo-ha di orú cubit: nkù otù cherub di cubit ise, nēmetu mb͕idi ulo ahu; nkù-ya nke-ọzọ di kwa cubit ise, nēmetu nkù cherub nke-ọzọ.
12. Nkù cherub nke-ọzọ di kwa cubit ise, nēmetu mb͕idi ulo: nkù-ya nke-ọzọ di cubit ise, nārapara na nkù cherub nke-ọzọ.
13. Nkù cherubim ndia nāb͕asa orú cubit: ha onwe-ha nēguzo kwa n'ukwu-ha, iru-ha che-kwa-ra n'ulo.
14. O me-kwa-ra ákwà-nb͕ochi nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, o we tua akika cherubim n'elu ya.
15. O me kwa n'iru ulo ogidi abua, orú cubit na iri na ise ka ogologo-ha di, isi nke di n'elu-ha n'otù n'otù di kwa cubit ise.
16. O me kwa iyab͕a n'ime-ime-ulo ahu, tiye ha n'elu ogidi ahu; o me-kwa-ra ọgu pomegranate ise, tiye ha n'elu iyab͕a.
17. O guzo ogidi abua ahu n'iru ulo uku Chineke, otù n'aka-nri, otù n'aka-ekpe; o we kpọ aha ogidi aka-nri Jakin, na aha ogidi aka-ekpe Boaz.