Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 3:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Solomon we malite iwu ulo Jehova nime Jerusalem n'ugwu Moraia, ebe Jehova mere ka Devid, bú nna-ya, hu Ya anya, nke o doziri n'ebe Devid rọputara, n'ebe-nzọcha-ọka Ọnan, bú onye Jebus.

2. O we malite iwu ulo ahu n'ubọchi nke-abua n'ọnwa nke-abua, n'arọ nke-anọ ọ bu eze.

3. Ma n'ihe ndia ka adọrọ Solomon aka na nti iwu ulo Chineke. Ogologo-ya na cubit n'ọtùtù mbu di ọgu cubit atọ, obosara-ya di kwa orú cubit.

4. Uzọ-nbata kwa nke di n'iru ulo ahu, ogologo-ya di orú cubit, n'iru obosara ulo ahu, idi-elu-ya di kwa ọgu cubit isi: o we were ọla-edo anāgwaghi agwa machita ya nime.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 3