Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 29:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Hezekaia malitere ibu eze mb͕e ọ b͕ara orú arọ na ise; o we buru eze orú arọ na iteghete nime Jerusalem: aha nne-ya bu Abaija nwa-nwayi Zekaraia.

2. O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Devid nna-ya mere.

3. Onye ahu, n'arọ mbu nke ọ bu eze, n'ọnwa mbu, o meghere uzọ ulo Jehova, me ka ha di ike.

4. O we me ka ndi-nchu-àjà na ndi Livai bata, o we chikọbata ha n'amá ọwuwa-anyanwu,

5. si ha, Nurunum, ndi Livai; ub͕u a donu onwe-unu nsọ, do kwa ulo Jehova, bú Chineke nna-unu-hà, nsọ, me ka idi na nsọ-unu pua n'ebe nsọ ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 29